Lamentations 3

1Abụ m onye hụrụla ahụhụ site
na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe Onyenwe anyị.
2O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa
nʼọchịchịrị kama nʼìhè.
3Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m,
mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile.

4O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ,
ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ.
5O busola m agha,
jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu.
6O meela ka m biri nʼọchịchịrị
dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga.

7Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ;
o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị.
8Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya,
ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka.
9O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile,
o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ.

10Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche,
na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya,
11o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ,
hapụ m na-enweghị onye inyeaka.
12Ọ dọọla ụta ya
mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata.

13O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya
gbapuo m obi.
14Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile;
ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile.
15O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ,
meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ.

16O meela ka m jiri okwute tajisie eze m,
o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m.
17Enweghị m udo,
echezọkwaala m ihe ọganihu bụ.
18Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa.
Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.”

19Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m,
ya na ihe ilu na oluilu.
20Mgbe m na-echeta ya,
obi m na-ada mba nʼime m.
21Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m
nke na-eme ka m nwee olileanya.

22Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa,
nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.
23Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile;
ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.
24Mkpụrụobi m na-ekwu, “Onyenwe anyị bụ oke m,
nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.”

25 Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya,
e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
26Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ
chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.
27Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya
mgbe ọ bụ okorobịa.

28Ya nọrọkwa duu naanị ya,
nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị bokwasịrị ya ibu ahụ.
29Ya tinye ihu ya nʼaja,
nʼihi na olileanya nwere ike dịrị.
30Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya,
ya kwerekwa ka ihe ihere ju ya afọ.

31Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo
mgbe ebighị ebi.
32Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya,
nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu.
33Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ,
maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ.

34Iji ụkwụ zọgbuo
ndị mkpọrọ nọ nʼala ahụ
35ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka
nʼihu Onye kachasị ihe niile elu,
36ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ.
Ọ bụ na Onyenwe anyị agaghị ahụ ihe ndị a?

37Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire
ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ?
38Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu
ka ihe ọma na ihe ọjọọ si abịa?
39Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu
mgbe ọ na-ahụ ahụhụ nʼihi mmehie ya?

40Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya.
Ka anyị lọghachikwutenụ Onyenwe anyị.
41Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye
Chineke nọ nʼeluigwe, sị:
42“Anyị emehiela, nupu isi,
ma ị gbagharabeghị.

43“I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ.
I gbuola anyị, jụ imere anyị ebere.
44I jiri igwe ojii kpuchie onwe gị
ka ekpere anyị ghara irute gị.
45I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụ
nʼetiti mba niile.

46“Ndị iro anyị niile asaghepụla ọnụ ha
megide anyị.
47Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche,
na mbibi na ịla nʼiyi.”
48Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta
nʼihi ndị m a lara nʼiyi.

49Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta
na-akwụsịghị akwụsị,
50tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe
ledata anya ma hụ.
51Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu,
nʼihi ọnọdụ nke ndị inyom niile nọ nʼime obodo m.

52Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla,
na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ.
53Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu
site nʼịtụ m nkume.
54Mmiri kpuchiri m isi,
echere m na-efuola m.

55Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị,
gị Onyenwe anyị.
56Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị.
Nụrụ arịrịọ inyeaka nke m na-arịọ gị.”
57Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị.
Ị sịrị, “Atụla egwu.”

58Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m,
gị gbapụtara ndụ m.
59 Onyenwe anyị, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m.
Kpechitere m ọnụ m.
60Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile
na nzube niile ha na-ezube megide m.

61 Onyenwe anyị, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha m
na nzube niile ha na-ezube megide m.
62Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro m
megide m ogologo ụbọchị niile.
63Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala.
Ha ji abụ na-akọcha m.

64 Onyenwe anyị, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha,
nʼihi ihe niile aka ha rụpụtara.
65Jiri ihe mkpudo kpuchie obi ha.
Meekwa ka ịbụ ọnụ gị dịkwasị ha.
66Site nʼiwe gị chụọ ha ọsọ. Laakwa ha nʼiyi nʼiwe gị,
ka ha ghara ịdịkwa nʼokpuru eluigwe nke Onyenwe anyị ọzọ.
Copyright information for IboBIU